Ihu mbụ
Edemede egosipụtara

Chimamanda Ngozi Adichie bụ onye odee akwụkwọ si na mba Nigeria. Amuru Adichie na obodo Enugu. Ọ gara akwụkwọ na Mahadum nke Nigeria. N'ebe ahụ, oji otu afọ na ọkara wee gụọ akwụkwọ gbasara ọgwụ. Ọ hapụrụ mba Naijiria gaba mba Amerika mgbe odi afo iri na-iteghete. Na mba Amerika, o bidoro akwụkwo na Drexel University nke di na Philadelphia, Pennsylvania. Site n'ebe ahụ, ọgụkwara na Eastern Connecticut State University, Johns Hopkins University, na Yale University.
Ọtụtụ n'ime akwụkwọ Adichie degara nwere ngalaba obibi na Nsukka ebe azulitere ya na ntakiri. Ọbụ mgbe ọ na agụ akwụkwọ na mahadum ka obidoro debe akwụkwo. Ọ buru ụzọ dee akwukwo abụ ana-akpọ Decisions n'afọ 1997, nke n'eso ya bụ For Love of Biafra n'afọ 1998. Ọ turu ugo na mmara ndị mmadu mgbe ọdechara akwụkwọ akụkọ izizi ya bụ Purple Hibiscus. Adichie akpọla Chinua Achebe na Buchi Emecheta ndị ndu ya na ihe odide. Ihe ndị odegoro gbasara ukwu na ndọrọ ndọrọ jikọtara ndị ọcha na ndị ojii okachasi site na ala Igbo.
Adichie ma ekwu okwu ọha. Ọnyekwala ọtụtụ okwu mmechi na mmeghe akwụkwo mahadum di iche iche nke gụnyere Williams College (2017), Harvard University (2018), na American University (2019). Ọnyere okwu ndị TEDx ana-akpọ "The Danger of a Single Story" n'afọ 2009 ya na "We Should All Be Feminists" n'afọ 2012. Ụfọdụ okwu ya ka onye na ede ma na eto egwu Beyoncé tinyere na egwu ya akpọrọ Flawless. Adichie atụrụla ọtụtụ ugo na ngalaba ịgụ akwụkwọ na ide akwụkwọ dịka MacArthur Fellowship n'afọ 2008 ma nnabata na otu ndị American Academy of Arts and Sciences n'afọ 2017.(Full article...)Ị maara? ...

- Igbo hailaif malitere mbụ na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa, n'oge 1950
- Ikwokirikwo (Ikwokilikwo) bụ ụdị egwu Igbo dị elu nke na-emetụta Ogene, Ụdị a pụtara na mbido 1970s.
- Egwu Atilogwu so na egwu ọdịnala a na-agba na Enugu Steeti
- Bongo Owerri (Bongo/Bongo Igbo) bụ ụdị egwu Igbo dị elu sitere na ndị Igbo bi na Owerri.
- Odumodu bụ ụdị egwu ndị mmadụ si Arochukwu, Bende, Ohafia, Abiriba, Umuahia, Ikwuano, na Ngwa ndị Igbo, nke Abia steeti.
- Egwu Egedege bụ otu n'ime ekike egwu ọdịnala ama ama na egwu ọdịnala ndị eze nke Igbo na-eme na Anambra.
- Egwu Agbachaekurunwa bụ ihe eji mara ndi Ụmụcho Ụmụediabali Ihitteaforukwu Ahịa azụ Mbaise n'Imo Steeti.
- Agborogwụ ma ọ bụ Ekereavụ bụ egwu eji mara Ogorinawuibe, Umumbiri Oparanadim Ekwerazu, Ahịa azụ Mbaise n'Imo steeti
- Egwu MMỤTAKA bụ egwu ndi obodo Ubaha nke di n' Umunze Anambra Steeti. Egwu a si n' egwu a na-akpo Mkpọkịtị wee pụta
- Na mba Netherlands, ndị mmadụ na-eji polders eme ka osimiri ghọọ ala ubi?
- Ka ọ dị na mba Arabic, "nke Alhambra" pụtara "ihe na-acha ọbara ọbara nke abụọ"?
Foto egosipụtara

Ọjà bụ ngwa egwu si n'ọwụwa anyanwụ Naijiria nke a na-ejikarị ngwa ndị Naijiria ndị ọzọ dị ka ekwe, udu, igba, okwa na ichaka/osha eji agu egwu. Ngwá egwú a pụrụ iche ‘na-ekwu okwu’ ka ndị na-akụ egwu na ndị na-agba egwú, na-agba egwu. N'oge a na-agba egwu mmawu na ọwụwa anyanwụ Naijiria, onye ọfụfụ oja na-edu egwu na abụ otuto. Onye isi ofufu ọjà na-enwe ike iwepụta ọtụtụ ụda dị ka okwu ọnụ. Ọ bụrụ na onye dị mkpa abanye n'ime oghere igba egwu, onye n'afu ọjà nwere ike iji ngwá egwu a kpọsaa aha onye ahụ.
Lee fòtó ndị ọzọ na Commons.Wikipedia's sister projects
Wikipedia is written by volunteer editors and hosted by the Wikimedia Foundation, a non-profit organization that also hosts a range of other volunteer projects:
-
Commons
Free media repository -
MediaWiki
Wiki software development -
Meta-Wiki
Wikimedia project coordination -
Wikibooks
Free textbooks and manuals -
Wikidata
Free knowledge base -
Wikifunctions
Catalog of computer functions -
Wikiquote
Collection of quotations -
Wikisource
Free-content library -
Wikispecies
Directory of species -
Wikiversity
Free learning tools -
Wikivoyage
Free travel guide -
Wiktionary
Dictionary and thesaurus
Wikipedia languages
This Wikipedia is written in English. Many other Wikipedias are available; some of the largest are listed below.
-
1,000,000+ articles
-
250,000+ articles
-
50,000+ articles